45Jisọs sịrị, “Onye metụrụ m aka?” Mgbe ọ na-enweghị onye pụtara kwuo sị na ọ bụ ya. Pita gwara ya sị, “Nna anyị ukwu, igwe mmadụ gbara gị gburugburu na-adakwasịkwa gị.”
46Ma Jisọs sịrị, “Otu onye metụrụ m aka; amatara m na ike esitela nʼime m pụọ.”
47Mgbe nwanyị ahụ hụrụ na ọ dịkwaghị ihe o nwere ike ime iji zoo onwe ya, o ji ịma jijiji bịa daa nʼụkwụ ya. Nʼihu mmadụ niile, ọ kọrọ ihe mere o ji metụ ya aka na otu e sị gwọọ ya nʼotu ntabi anya.
48Ọ gwara ya sị, “Ada m nwanyị, okwukwe gị agwọọla gị. Laa nʼudo.”
49Mgbe ọ ka nọ na-ekwu okwu, otu onye si nʼụlọ Jairọs bụ onyeisi ụlọ ekpere, bịara sị, “Ada gị nwanyị anwụọla, enyekwala onye ozizi nsogbu ọzọ.”