Luk 8

“Ọgha mkpụrụ pụrụ ịkụ mkpụrụ ya, mgbe ọ nọ na-agha mkpụrụ ndị a, ụfọdụ nʼime mkpụrụ ahụ dara nʼakụkụ ụzọ ebe ndị mmadụ zọrọ ha ụkwụ, ụmụ nnụnụ bịakwara tụrịa ha loo.

Luke 8:5 (UKJV) A sower went out to sow his seed: and as he sowed, some fell by the way side; and it was trodden down, and the fowls of the air devoured it.

3na Joana nwunye Chuza onye na-elekọta ụlọeze Herọd na akụ ya niile, na Suzana, na ọtụtụ ndị ọzọ ndị ji akụ ha na-enyere ha aka.

4Mgbe oke igwe mmadụ gbakọrọ ha na ndị mmadụ si nʼobodo dị iche iche bịakwute ya. Ọ tụụrụ ha ilu a sị,

5“Ọgha mkpụrụ pụrụ ịkụ mkpụrụ ya, mgbe ọ nọ na-agha mkpụrụ ndị a, ụfọdụ nʼime mkpụrụ ahụ dara nʼakụkụ ụzọ ebe ndị mmadụ zọrọ ha ụkwụ, ụmụ nnụnụ bịakwara tụrịa ha loo.

6Ụfọdụ nʼime ha dakwasịrị nʼelu nkume. Mgbe ha puputara chọọ ito, ha kpọnwụrụ nʼihi na mgbọrọgwụ ha enweghị ike ịmịta mmiri mkpụrụ ahụ ga-eji dị ndụ.

7Ụfọdụ dara nʼetiti ogwu, ogwu ndị a sooro ha puo ma kpagbuo ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.