12Ka Onyenwe anyị kewapụ onye mere ihe dị otu a nʼụlọ ikwu Jekọb, ka ọ ghara inwe onye akaebe, ka ọ ghara inwe onye ga-aza ya mgbe ọ kpọrọ oku maọbụ butere Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile onyinye.
13Ihe ọzọ unu na-emekwa bụ ndị a: unu na-eme ka anya mmiri unu jupụta nʼebe ịchụ aja Onyenwe anyị. Unu na-akwa akwa, na-eti mkpu akwa nʼihi na ọ naghị elenye anya nʼonyinye unu, maọbụ jiri obi ụtọ nabata ha.
14Unu na-asị “Nke a ọ bụ nʼihi gịnị?” Ọ bụ nʼihi na Onyenwe anyị bụ onyeama nʼetiti gị na nwunye ị lụrụ nʼokorobịa gị, nʼihi na ị kwesighị ntụkwasị obi, ọ bụ ezie na ọ bụ nwanyị e jikọtara gị na ya, bụrụkwa nwunye ọgbụgba ndụ gị.
15Ọ bụ na ọ bụghị otu Chineke ahụ kere gị? Nʼanụ ahụ na nʼime mmụọ, unu bụ nke ya. Ma gịnị ka otu Chineke a chọrọ? Ka unu bụrụ ụmụ na-atụ ya egwu. Ya mere, jie mmụọ gị aka, ka ị gharakwa ịbụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nʼebe nwunye ị lụtara nʼokorobịa nọ.
16“Akpọrọ m ịgba alụkwaghị m asị,” ka Onyenwe anyị Chineke nke Izrel sịrị, “a kpọkwara nwoke na-emeso nwunye ya mmeso nʼụzọ ihe ike asị.” Ọ bụ Onyenwe Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu. Ya mere, kpachapụrụnụ onwe unu anya, unu abụkwala ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi.