1“Ma ugbu a, unu ndị nchụaja, ịdọ aka na ntị a dịrị unu.
2Ọ bụrụ na unu ajụ ige ntị, ọ bụrụkwa na unu ekpebighị nʼobi unu inye aha m otuto,” ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, na-ekwu, “Aga m ezite ọbụbụ ọnụ nʼahụ unu, aga m abụkwa ngọzị unu niile ọnụ. E, abụọlarị unu ọnụ, nʼihi na unu ekpebighị nʼobi unu ịsọpụrụ m.
3“Nʼihi unu, aga m abara ụmụ ụmụ unu mba. Agaghị m anabata onyinye unu, aga m efesakwa nsị anụ nʼihu unu, bụ nsị nke ihe onyinye unu, aga m ewezugakwa unu site nʼihu m.
4Otu a ka unu ga-esi mara na ọ bụ mụ zitere unu ịdọ aka na ntị a, ka ọgbụgba ndụ mụ na Livayị gbara dịgide,” Ọ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, na-ekwu.
5“Ọgbụgba ndụ mụ na ya bụ nke ndụ na udo, ọ bụ m nyere ha ya, nke a bụ nʼihi nsọpụrụ. O nyere m nsọpụrụ nʼezie, tụkwaa aha m egwu.