9Ya mere, ihe Chineke jikọtara, ka mmadụ ọbụla atọsala ya.”
10Mgbe ha banyere nʼụlọ, ndị na-eso ụzọ ya jụrụ ya ọzọ ihe banyere okwu a.
11Ọ sịrị ha, “Onye ọbụla gbara nwunye ya alụkwaghị m ma lụrụ nwanyị ọzọ na-eme mmehie ịkwa iko megide ya.
12Ma ọ bụrụ na nwanyị ọbụla agbaa dị ya alụkwaghị m ma lụrụ nwoke ọzọ, ọ na-emekwa mmehie ịkwa iko.”
13Ndị mmadụ na-ekutere ya ụmụntakịrị ka o metụ ha aka, ma ndị na-eso ụzọ ya baara ha mba.