1Ọ hapụrụ ebe ahụ gaa nʼobodo ndị dị na mpaghara Judịa ma gafeekwa nʼofe Jọdan. Igwe mmadụ bịakwutekwara ya, ọzọ, dị ka o si emekwa, o ziri ha ihe.
2Ụfọdụ ndị Farisii bịara, ma nʼihi ị nwalee ya, ha jụrụ ya sị, “O ziri ezi nʼiwu ka nwoke gbaa nwunye ya alụkwaghị m?”
3Ma ọ zara ha sị, “Gịnị ka Mosis nyere unu nʼiwu?”
4Ha sịrị, “Mosis kwenyere ka nwoke dee asambodo alụkwaghị m, nye nwunye ya ma zilaga ya.”
5Jisọs sịrị ha, “Ọ bụ nʼihi na obi unu siri ike nke ukwuu ka o ji deere unu iwu a.