Mak 10

Ma ọtụtụ ndị bu ụzọ ga-abụ ndị ikpeazụ, ma ọtụtụ ndị ikpeazụ ga-abụkwa ndị bu ụzọ.”

Mark 10:31 (UKJV) But many that are first shall be last; and the last first.

29Jisọs sịrị, “Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, ọ dịghị onye ọbụla hapụrụ ụlọ ya, maọbụ ụmụnne ya ndị nwoke, maọbụ ụmụnne ya ndị nwanyị, maọbụ nne ya, maọbụ nna ya, maọbụ ụmụntakịrị ya, maọbụ ala ubi ya nʼihi m, na nʼihi oziọma a,

30nke na-agaghị anataghachikwa nʼụwa a, ụlọ, ụmụnne ndị nwoke, ụmụnne ndị nwanyị, nne, ụmụaka na ala ubi, tinyere mkpagbu, ihe ruru okpukpu narị karịa ihe niile nke ọ hapụrụ. Ọ ga-anatakwa ndụ ebighị ebi nʼụwa ọzọ.

31Ma ọtụtụ ndị bu ụzọ ga-abụ ndị ikpeazụ, ma ọtụtụ ndị ikpeazụ ga-abụkwa ndị bu ụzọ.”

32Ha nọ nʼụzọ na-aga Jerusalem, ma Jisọs nọ nʼihu ha, nke a juru ndị na-eso ụzọ ya nʼanya. Otu a kwa, ndị mmadụ niile na-abịa ha nʼazụ tụkwara egwu. Ọzọkwa, ọ kpọpụrụ mmadụ iri na abụọ ahụ nʼakụkụ, malite ịgwa ha ihe gaje ịdakwasị ya.

33Ọ sịrị, “Leenụ, anyị na-aga Jerusalem, ebe a ga-arara Nwa nke Mmadụ nyefee nʼaka ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu. Ha ga-ama ya ikpe ọnwụ, nyefekwa ya nʼaka ndị mba ọzọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.