10“Ngọzị dịrị alaeze ahụ na-abịa nke nna anyị Devid!” “Hozanna nʼebe kachasị ihe niile elu!”
11Mgbe ọ batara na Jerusalem, ọ gara nʼime nʼụlọnsọ ukwu ahụ. Mgbe o legharịchara anya nʼihe niile dị nʼebe ahụ, ma ebe ọ bụ na chi ejiela, ya na ndị na-eso ụzọ ya pụrụ gaa Betani.
12Nʼechi ya, mgbe ha si Betani na-apụta, agụụ gụrụ ya.
13Site nʼebe dị anya, ọ hụrụ otu osisi fiig nke nwere akwụkwọ ndụ. Mgbe ọ bịaruru osisi ahụ nso, ọ gagharịrị nʼukwu ya niile ma ọ ga-achọta mkpụrụ nʼelu ya, ma ọ hụghị mkpụrụ ọbụla, naanị akwụkwọ ndụ, nʼihi na oge a abụghị oge osisi a ji amị mkpụrụ.
14Mgbe ahụ, ọ gwara osisi ahụ sị, “Ka mmadụ ọbụla ghara iri mkpụrụ sitere na gị ruo ebighị ebi.” Ndị na-eso ụzọ ya nụrụ mgbe o kwuru okwu a.