23Nʼezie agwa m unu, ọ bụrụ na onye ọbụla asị ugwu a, ‘Si nʼebe a wezuga onwe gị, gaa dabanye nʼoke osimiri,’ nke na-enweghị obi abụọ nʼime ya, kama o kweere na ihe o kwuru ga-emezu, ihe ahụ ọ kwuru ga-emezukwa.
24Ya mere, ka m gwa unu, ihe ọbụla unu rịọrọ nʼekpere, kwerenụ na unu anatala ya, ọ ga-abụkwa nke unu.
25Ma mgbe ọbụla unu guzoro na-ekpe ekpere, gbagharanụ, ma ọ bụrụ na unu nwere ihe ọbụla megide onye ọbụla, ka Nna unu nke bi nʼeluigwe gbagharakwa unu mmehie unu.
26Ma ọ bụrụ na unu agbagharaghị, Nna unu nke bi nʼeluigwe agaghị agbagharakwa unu mmehie unu.”
27Mgbe ha rutere Jerusalem ọzọ, ọ nọ na-ejegharị nʼime ogige ụlọnsọ ukwu ahụ, ndịisi nchụaja, na ndị ozizi iwu na ndị okenye ndị Juu bịakwutere ya.