31Ha kparịtara ụka nʼetiti onwe ha ma sị, “Ọ bụrụ na anyị asị, ‘O sitere nʼeluigwe,’ ọ ga-asị anyị, ‘Gịnị mere unu na-ejighị kwenye na ya?’
32Ma ọ bụrụ na anyị asị, ‘O sitere nʼaka mmadụ.’ ” (Ha na-atụ egwu ndị mmadụ, nʼihi na ha niile kwenyere na Jọn bụ onye amụma nʼezie.)
33Ya mere ha zara Jisọs sị, “Anyị amaghị.” Jisọs zaghachikwara ha sị, “Agakwaghị m agwa unu ụdị ikike m ji na-eme ihe ndị a.”