27Mgbe ahụ, ọ ga-ezipụ ndị mmụọ ozi ya ka ha kpokọta ndị a họpụtara site nʼakụkụ anọ niile nke ụwa. Site na nsọtụ niile nke ụwa ruo na nsọtụ niile nke eluigwe.
28“Ugbu a, mụtanụ ihe site nʼosisi fiig. Mgbe ọbụla alaka ya dị nro malite iwepụta akwụkwọ ndụ, unu maara na ọkọchị dị nso.
29Nʼụzọ dị otu a, mgbe unu hụrụ ihe ndị a niile ka ha bidoro ime, matanụ na ọ nọ nso, ọ nọkwa nʼọnụ ụzọ.
30Ana m agwa unu eziokwu na ọgbọ a agaghị agabiga tupu ihe ndị a niile emezuo.
31Eluigwe na ụwa ga-agabiga ma okwu m ga-adịgide.