30Ana m agwa unu eziokwu na ọgbọ a agaghị agabiga tupu ihe ndị a niile emezuo.
31Eluigwe na ụwa ga-agabiga ma okwu m ga-adịgide.
32“Ma banyere ụbọchị ahụ, maọbụ oge awa ahụ, o nweghị onye ọbụla maara, ọ bụladị ndị mmụọ ozi nke eluigwe, maọbụ Ọkpara ahụ, kama naanị Nna ahụ maara ya.
33Ebe ọ bụ na unu amaghị mgbe ha ga-emezu, nọrọnụ na nche! Mụrụkwanụ anya!
34Ọ dị ka nwoke hapụrụ ụlọ ya na-aga njem, tinye nʼaka ndị ohu ya ilekọta ihe, onye ọbụla nʼime ha ka o nyere ọrụ ọ ga-arụ ma nyekwa onye nche ọnụ ụzọ iwu ka ọ nọ na nche.