3Ka ọ nọdụrụ nʼoche nri na Betani nʼụlọ Saimọn onye ekpenta, otu nwanyị bu karama alabasta mmanụ otite dị oke ọnụahịa, nke e jiri ezigbo naad mee, batara. Ọ kụwara karama ahụ, wụsa ya mmanụ otite ahụ nʼisi.
4Ụfọdụ ndị nọ nʼebe ahụ were iwe nke ukwuu. Ha sịrịtara onwe ha, “Gịnị mere e jiri laa mmanụ otite nke a nʼiyi otu a?
5A gaara ere mmanụ otite a ihe karịrị narị denarị atọ, were ego e retara ya nye ndị ogbenye.” Ha baara ya mba nʼolu ike.
6Ma Jisọs sịrị, “Hapụnụ ya aka. Gịnị mere unu ji esogbu ya? Ọ bụ ezi ọrụ ka ọ rụrụ nʼebe m nọ.
7Unu na ndị ogbenye na-anọ oge niile, unu nwekwara ohere inyere ha aka mgbe ọbụla unu chọrọ. Ma mụ na unu agaghị anọ tee anya.