54Pita sooro ha, ma ọ nọ nʼebe dị anya. O sooro ha bata nʼobi onyeisi nchụaja. Nʼebe ahụ, o sooro ndị nche nọdụ ọdụ na-anya ọkụ.
55Ndịisi nchụaja na ndịisi ikpe nʼụlọikpe ukwu nọ na-achọ ama megide Jisọs, ka ha nwee ike gbuo ya. Ma ọ dịghị nke ha chọtara.
56Ọtụtụ bịara gbaa ama ụgha megide ya, ma ama ha abụghị otu.
57Mgbe ahụ ụfọdụ biliri gbaa ama ụgha megide ya, sị,
58“Anyị nụrụ mgbe o kwuru sị, ‘Aga m akwatu ụlọnsọ ukwu a nke e ji aka wuo, nʼụbọchị atọ aga m ewukwa ụlọ ọzọ, nke a na-ejighị aka wuo.’ ”