Mak 14

O mere ihe o nwere ike, ọ na-ete m mmanụ otite a ugbu a iji kwado ahụ m maka olili a ga-eli ya.

Mark 14:8 (UKJV) She has done what she could: she has come beforehand to anoint my body to the burying.

6Ma Jisọs sịrị, “Hapụnụ ya aka. Gịnị mere unu ji esogbu ya? Ọ bụ ezi ọrụ ka ọ rụrụ nʼebe m nọ.

7Unu na ndị ogbenye na-anọ oge niile, unu nwekwara ohere inyere ha aka mgbe ọbụla unu chọrọ. Ma mụ na unu agaghị anọ tee anya.

8O mere ihe o nwere ike, ọ na-ete m mmanụ otite a ugbu a iji kwado ahụ m maka olili a ga-eli ya.

9Nʼezie, ana m agwa unu, nʼebe ọbụla a ga-ekwusa oziọma a nʼụwa niile, ọrụ a ọ rụrụ ka a ga-akọkwa akụkọ ya, iji cheta ihe ọma a o mere.”

10Mgbe ahụ Judas Iskarịọt, otu nʼime ndị ozi iri na abụọ ahụ jekwuuru ndịisi nchụaja ịgba izu otu ọ ga-esi rara ya nye ha nʼaka.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.