1Nʼezigbo isi ụtụtụ, ndịisi nchụaja na ndị okenye na ndị ozizi iwu, na ndị nzukọ ndị okenye niile, nwere mkpebi. Ha kere Jisọs agbụ, duru ya nyefee nʼaka Pailet.
2Pailet jụrụ ya sị, “Ị bụ eze ndị Juu?” Ọ zara sị ya, “Gị onwe gị kwuru ya.”
3Mgbe ahụ ndịisi nchụaja boro ya ebubo banyere ọtụtụ ihe.