Mak 15

Ma Jisọs azaghị ihe ọzọ. Nke a juru Pailet anya.

Mark 15:5 (UKJV) But Jesus yet answered nothing; so that Pilate marvelled.

3Mgbe ahụ ndịisi nchụaja boro ya ebubo banyere ọtụtụ ihe.

4Pailet jụrụ ya ajụjụ ọzọ sị, “Ọ bụ na ị nweghị ọsịsa ọbụla? Lee ọtụtụ ebubo ha na-ebo gị.”

5Ma Jisọs azaghị ihe ọzọ. Nke a juru Pailet anya.

6Ugbu a, ọ bụ omenaala nʼoge mmemme, na a ga-ahapụ otu onye mkpọrọ, bụ onye ha rịọrọ ka a hapụ.

7Nʼoge ahụ kwa, otu nwoke a na-akpọ Barabas nọ nʼụlọ mkpọrọ, ya na ụfọdụ ndị biliri megide isi ọchịchị, ndị gbukwara mmadụ nʼoge ọgbaaghara ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.