25Ọ bụrụ na ezinaụlọ ekewa megide onwe ya, ezinaụlọ ahụ apụghị iguzo.
26Ọ bụrụkwa na ekwensu ebilie megide onwe ya si otu a nwee nkewa, o nweghị ike iguzo; kama ọgwụgwụ oge ya abịala nso.
27Nʼezie, ọ dịghị onye nwere ike ịbanye nʼụlọ nwoke dị ike kwakọrọ ngwongwo ya niile, ma o bughị ụzọ kee nwoke ahụ siri ike agbụ. Mgbe ahụ ọ ga-enwe ike ịbanye nʼụlọ ya, zukọrọ ngwongwo ya niile.
28Nʼezie agwa m unu, na a ga-agbaghara ụmụ mmadụ mmehie na nkwulu niile nke ha kwuru.
29Ma onye ọbụla ga-ekwulu Mmụọ Nsọ, enweghị ike ịgbaghara ya. Ọ bụ onye ikpe mmehie ebighị ebi mara.”