6Ngwangwa, ndị Farisii sitere nʼebe ahụ pụọ nʼiwe. Gaa soro ndị otu Herọd gbaa izu otu ha ga-esi laa ya nʼiyi.
7Ma Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya sitere nʼebe ahụ pụọ gaa nọdụ nʼakụkụ osimiri. Igwe mmadụ ndị sitere na Galili sooro ya.
8Mgbe ha nụrụ ihe niile ọ na-eme, ọtụtụ mmadụ bịakwutere ya site na Judịa, na Jerusalem, na Idumia na obodo ndị dị nʼofe Jọdan, na gburugburu Taịa na Saịdọn.
9Nʼihi ịdị ukwuu nke igwe mmadụ ahụ, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha debere ya ụgbọ mmiri nta nso ka ọ banye, iji gbochie igwe mmadụ ahụ ịkpagbu ya.
10Nʼihi na ọ gwọọla ọtụtụ ndị ọrịa, nke mere na ndị bu ọrịa dị iche iche na-agbalịsị ike ịmetụ ya aka.