24Ọ sịrị ha, “Kpacharanụ anya ihe unu na-anụ. Ọ bụkwa ihe unu ji tụọrọ ndị ọzọ ka a ga-eji tụọrọ unu, maọbụ karịa.
25Onye nwere ihe ka a ga-enye karịa; onye na-enweghị, ọ bụladị nke o nwere ka a ga-anapụ ya.”
26Ọ sịkwara, “Alaeze Chineke yiri ihe dị otu a. Ọ dịka mgbe otu onye ghara mkpụrụ nʼala ubi.
27Ehihie na abalị, ma ọ nọ nʼụra ma o tetara, mkpụrụ ahụ na-epupụte na-etokwa, ma ọ maghị ka o si na-eme.
28Ala ahụ nʼonwe ya na-eme ka mkpụrụ ahụ puo. Ọ na-epupụte na mbụ, too oko, emesịa isi ọka, nʼikpeazụ ọ mịkwara mkpụrụ kara aka nʼoko ya.