27Ehihie na abalị, ma ọ nọ nʼụra ma o tetara, mkpụrụ ahụ na-epupụte na-etokwa, ma ọ maghị ka o si na-eme.
28Ala ahụ nʼonwe ya na-eme ka mkpụrụ ahụ puo. Ọ na-epupụte na mbụ, too oko, emesịa isi ọka, nʼikpeazụ ọ mịkwara mkpụrụ kara aka nʼoko ya.
29Mgbe ọka ahụ chara ịghọ ya, o na-eji mma iwe ihe ubi ya bịa gbutuo ọka ahụ, ghọrọkwa ogbe ọka laa, nʼihi na oge iwe ihe nʼubi eruola.”
30Ọzọkwa, ọ sịrị, “Gịnị ọzọ ka anyị pụrụ ịsị na alaeze Chineke yiri? Ụdị ilu dị aṅaa ka anyị ga-eji kọwaa ya?
31Ọ dị ka mkpụrụ mọstaadị, nke bụ mkpụrụ dịkarịsịrị nta nke a na-akụ nʼala.