Mak 4

Nʼụbọchị ahụ nʼoge uhuruchi, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Ka anyị gafee nʼofe nke ọzọ.”

Mark 4:35 (UKJV) And the same day, when the even was come, he says unto them, Let us pass over unto the other side.

33O jiri ọtụtụ ilu yiri ndị a gwa ha okwu dị ka ha pụrụ ịghọta.

34O nweghị oge ọbụla ọ gwara ha okwu hapụ iji ilu. Ma ya na ndị na-eso ụzọ ya naanị nọdụ, ọ na-akọwara ha ihe niile.

35Nʼụbọchị ahụ nʼoge uhuruchi, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Ka anyị gafee nʼofe nke ọzọ.”

36Ha hapụrụ igwe mmadụ ahụ ma kpọrọ ya, otu ọ dị, ya na ha banyere nʼime ụgbọ. Ụgbọ ndị ọzọ dịkwa na-eso ya.

37Oke ifufe dị ike bidoro ife, ebili mmiri na-awụbakwa nʼụgbọ ahụ ruo na ụgbọ ha fọdụrụ ntakịrị ka mmiri mie ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.