Mak 4

Ụfọdụ mkpụrụ dara nʼala nkume, ebe aja ntakịrị dị. Ha puputara ngwangwa nʼihi na ala dị nʼebe ahụ emighị emi.

Mark 4:5 (UKJV) And some fell on stony ground, where it had not much earth; and immediately it sprang up, because it had no depth of earth:

3“Geenụ ntị! Otu onye ọrụ ubi pụrụ gaa ịkụ mkpụrụ ya.

4Mgbe ọ na-agha mkpụrụ, ụfọdụ mkpụrụ dara nʼakụkụ ụzọ, ụmụ nnụnụ bịara tụtụrịa ha.

5Ụfọdụ mkpụrụ dara nʼala nkume, ebe aja ntakịrị dị. Ha puputara ngwangwa nʼihi na ala dị nʼebe ahụ emighị emi.

6Ma mgbe anwụ wara, ọ chagburu ha, ha kpọnwụọ nʼihi na ha enweghị mgbọrọgwụ.

7Mkpụrụ ndị ọzọ dara nʼetiti ogwu; ogwu ahụ tolitere kpagbuo ha. Ha amịkwaghị mkpụrụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.