Mak 4

Ọ sịrị ha, “Onye ọbụla nwere ntị ịnụ ihe, ya nụrụ.”

Mark 4:9 (UKJV) And he said unto them, He that has ears to hear, let him hear.

7Mkpụrụ ndị ọzọ dara nʼetiti ogwu; ogwu ahụ tolitere kpagbuo ha. Ha amịkwaghị mkpụrụ.

8Mkpụrụ ndị ọzọ nke dara nʼezi ala, puru, tolite, ma mịa mkpụrụ na mmụba iri atọ, iri isii, ọ bụladị otu narị.”

9Ọ sịrị ha, “Onye ọbụla nwere ntị ịnụ ihe, ya nụrụ.”

10Ma mgbe ọ nọ naanị ya, ndị ozi iri na abụọ ahụ na ndị ọzọ nọ ya gburugburu jụrụ ya ajụjụ banyere ilu ahụ.

11Ọ gwara ha sị, “Enyela unu ihe omimi nke alaeze Chineke. Ma ndị nọ nʼezi, a na-agwa ha ihe niile nʼilu,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.