32Ya mere ha pụrụ baa nʼime ụgbọ mmiri gaa nʼebe ha ga-anọdụrụ naanị onwe ha.
33Ma ọtụtụ mmadụ ndị hụrụ ha mgbe ha na-apụ matara ha, sitekwara nʼobodo niile dị ebe ahụ gburugburu gbara ọsọ gbaruo ebe ahụ tupu ya na ndị na-eso ụzọ ya abịaruo.
34Mgbe o sitere nʼụgbọ mmiri rịdata, ọ hụrụ oke igwe mmadụ a ka ha zukọrọ. O nwere ọmịiko nʼebe ha nọ, nʼihi na ha dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha. Ọ malitekwara izi ha ọtụtụ ihe.
35Nʼoge a, ọchịchịrị ebidola ịgba, nʼihi ya, ndị na-eso ụzọ ya bịara gwa ya, “Ebe a bụ ọzara, chi ejiekwala.
36Zilaga ndị a, ka ha gaa nʼobodo nta ndị dị gburugburu ebe a, zụtara onwe ha ihe ha ga-eri.”