29Mgbe ahụ, ọ sịrị ya, “Nwanyị, ị zara nke ọma, nʼihi ọsịsa gị, laa, mmụọ ọjọọ ahụ ahapụla nwa gị nwanyị ugbu a.”
30Ọ laghachiri nʼụlọ ya, hụ nwantakịrị ahụ ka o dina nʼelu ihe ndina, mmụọ ọjọọ ahụ apụọkwala.
31Emesịa, ọ hapụrụ akụkụ Taịa gabiga Saịdọn bịaruo nʼosimiri Galili ruo nʼobodo ndị dị na Dekapọlịs.
32Ha duteere ya otu nwoke ntị chịrị, nke na-asụkwa oke nsụ. Ha rịọrọ ya ka o bikwasị ya aka.
33O duuru ya pụọ nʼebe igwe mmadụ ahụ nọ, rụnye ya mkpịsịaka nʼime ntị ya abụọ. Mgbe ahụ ọ gbụpụkwara ọnụ mmiri metụkwa ya aka nʼire.