19Mgbe m ji ogbe achịcha ise zụọ puku mmadụ ise, iberibe achịcha juru nkata ole ka unu tụtụkọtara?” Ha zara sị ya, “Nkata iri na abụọ.”
20“Mgbe m ji ogbe achịcha asaa zụọ puku mmadụ anọ, iberibe achịcha juru nkata ole ka unu tụtụkọtara?” Ha zara sị ya, “Nkata asaa.”
21Ọ sịrị ha, “Unu ka nọ na-enweghị nghọta?”
22Mgbe ha ruru Betsaida, ụfọdụ mmadụ kpọtaara ya otu onye ìsì rịọọ ya ka o metụ ya aka,
23Ọ duuru onye ìsì ahụ nʼaka pụọ nʼazụ obodo. Mgbe ahụ, ọ gbụsara ọnụ mmiri nʼanya ya metụkwa ya aka nʼanya. Ọ jụrụ ya sị, “Ị na-ahụ ihe ọbụla?”