30Ọ dọrọ ha aka na ntị sị ha agwakwala onye ọbụla ihe banyere ya.
31Emesịa, o bidoro izi ha ihe na Nwa nke Mmadụ aghaghị ịhụ ọtụtụ ahụhụ dị iche iche, ndị okenye, na ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu ga-ajụ ya, na aghaghị igbu ya, ma ọ ga-ebili nʼọnwụ mgbe ụbọchị nke atọ gasịrị.
32Ọ gwaghere ha ihe ndị a ọnụ. Ma Pita kpọọrọ ya pụọ nʼotu akụkụ, bido ịbara ya mba.
33Ma ọ tụgharịrị lee ndị na-eso ụzọ ya anya, baara Pita mba sị ya, “Si nʼebe m nọ pụọ ekwensu! Ihe ị na-eche echiche ya abụghị uche Chineke, ha bụ echiche mmadụ.”
34Mgbe ahụ, ọ kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya na igwe mmadụ ahụ. Ọ gwara ha sị, “Ọ bụrụ na onye ọbụla achọọ iso m, ya gụọ ndụ ya dị ka ihe furu efu. Mgbe ahụ, ya buru obe ya soro m nʼazụ.