Mak 9

Ma ha aghọtaghị ihe ọ na-agwa ha. Egwu tụkwara ha ị jụ banyere ya.

Mark 9:32 (UKJV) But they understood not that saying, and were afraid to ask him.

30Ha siri nʼebe ahụ pụọ gafee Galili. Ọ chọghị ka onye ọbụla mata maka ya,

31nʼihi na ọ na-ezi ndị na-eso ụzọ ya ihe. Ọ sịrị ha, “A ga-arara Nwa nke Mmadụ nye nʼaka ụmụ mmadụ, ha ga-egbukwa ya ma ọ ga-ebili nʼọnwụ mgbe mkpụrụ ụbọchị atọ gasịrị.”

32Ma ha aghọtaghị ihe ọ na-agwa ha. Egwu tụkwara ha ị jụ banyere ya.

33Emesịa, ha bịaruru Kapanọm. Mgbe ọ banyere nʼụlọ, ọ jụrụ ha sị, “Gịnị ka unu na-arụrịta ụka banyere ya nʼokporoụzọ?”

34Ma ha gbara nkịtị, nʼihi na ha rụrịtara ụka nʼokporoụzọ banyere onye dị ukwuu karịa ibe ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.