38Jọn sịrị ya, “Onye ozizi, anyị hụrụ otu onye na-achụpụ mmụọ ọjọọ nʼaha gị, ma anyị gbalịrị igbochi ya nʼihi na ọ bụghị otu onye nʼime anyị.”
39Ma Jisọs gwara ha sị, “Unu egbochila ya, nʼihi na onye ọbụla ji aha m na-arụ ọrụ ebube agaghị ekwu okwu ọjọọ megide m.
40Nʼihi na onye ọbụla na-adịghị emegide anyị dịnyeere anyị.
41Nʼeziokwu asị m unu, onye ọbụla ga-ekunye unu otu iko mmiri nʼaha m, nʼihi na unu bụ ndị nke Kraịst, ga-anatakwa ụgwọ ọrụ ya.
42“Ọ bụrụkwa na onye ọbụla emee ka otu nʼime ndị a dị nta kweere na m jehie, ọ ga-akara onye ahụ mma ma ọ bụrụ na e kenyere nkume igwe nri buru ibu nʼolu ya, tụnye ya nʼime oke osimiri.