41Nʼeziokwu asị m unu, onye ọbụla ga-ekunye unu otu iko mmiri nʼaha m, nʼihi na unu bụ ndị nke Kraịst, ga-anatakwa ụgwọ ọrụ ya.
42“Ọ bụrụkwa na onye ọbụla emee ka otu nʼime ndị a dị nta kweere na m jehie, ọ ga-akara onye ahụ mma ma ọ bụrụ na e kenyere nkume igwe nri buru ibu nʼolu ya, tụnye ya nʼime oke osimiri.
43Ọ bụrụ na aka gị na-eme ka i jehie, gbupụ ya. Ọ ga-akara gị mma inwe ọrụsị baa na ndụ karịa inwe aka abụọ banye nʼọkụ ala mmụọ, ebe ọkụ ya na-adịghị anyụ anyụ;
44ebe “ ‘ikpuru ya na-adịghị anwụ anwụ, ọkụ ya adịghị anyụkwa anyụ.’
45Ọ bụrụ na ụkwụ gị na-eme ka i jehie, gbupụ ya, tufukwaa ya, nʼihi na ọ ga-akara gị mma ịba na ndụ na ngwụrọ karịa inwe ụkwụ abụọ a tụnye gị nʼọkụ ala mmụọ;