34Ụmụ ajụala, olee otu unu ga-esi kwuo okwu dị mma, ebe obi unu dị njọ? Nʼihi na ihe mmadụ kwuru bụ ihe si ya nʼobi pụta.
35Ezi mmadụ na-esi nʼezi akụ ya wepụta ihe dị mma, ma ajọ mmadụ na-esitekwa nʼajọ akụ ya wepụta ajọọ ihe.
36Ma ana m agwa unu sị, nʼụbọchị ikpe ahụ, onye ọbụla ga-aza ajụjụ, banyere okwu niile na-enweghị isi o kwuru.
37Nʼihi na ọ bụ site nʼokwu ọnụ gị ka ị ga-abụ onye ikpe mara, sitekwa nʼokwu ọnụ gị ka ị ga-abụ onye ikpe na-amaghị.”
38Mgbe ahụ, ụfọdụ ndị ozizi iwu na ndị Farisii gwara Jisọs sị ya, “Onye nkuzi, anyị chọrọ ka i gosi anyị ihe ịrịbama.”