Matiu 12

Mgbe ọ nọ na-agwa igwe mmadụ ahụ okwu, nne ya na ụmụnne ya bịara guzoro nʼezi na-eche ka ha gwa ya okwu.

Matthew 12:46 (UKJV) While he yet talked to the people, behold, his mother and his brethren stood without, desiring to speak with him.

44Mgbe ahụ, ọ na-asị, ‘Aga m alaghachi nʼụlọ m, ebe m si pụta.’ Mgbe ọ lọghachiri, ọ na-achọpụta na a zachara ụlọ ahụ dozie ya, ọ dịkwaghị onye bichiri nʼime ya.

45Mgbe ahụ, ọ na-apụ gaa chọta mmụọ asaa ọzọ, ndị dị njọ karịa ya onwe ya. Ha niile na-abata bịa biri nʼime onye ahụ. Mee ka ọnọdụ ya dị njọ karịa ka ọ dị na mbụ. Otu a ka ọ ga-adịrị ndị bi nʼọgbọ a jọrọ njọ.”

46Mgbe ọ nọ na-agwa igwe mmadụ ahụ okwu, nne ya na ụmụnne ya bịara guzoro nʼezi na-eche ka ha gwa ya okwu.

47Otu onye nʼime igwe mmadụ ahụ gwara ya okwu sị, “Lee, nne gị na ụmụnne gị ndị nwoke na-achọ ịhụ gị nʼezi. Ha chọrọ ịgwa gị okwu.”

48Ma ọ zara onye ahụ gwara ya okwu sị, “Onye bụ nne m? Olee ndị bụ ụmụnne m ndị nwoke?”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.