45“Ọzọ, alaeze eluigwe yiri nkume dị oke ọnụahịa nke onye na-azụ ahịa chọtara.
46Mgbe ọ hụrụ nkume a, o ree ihe niile o nwere, were ego ya gaa zụrụ nkume a dị oke ọnụahịa.
47“Ọzọkwa, alaeze eluigwe dị ka ụgbụ e ji egbu azụ, nke a wụnyere nʼime osimiri, jiri ya jide azụ dị iche iche.
48Mgbe ụgbụ a juru, ndị ọkụ azụ ahụ na-adọpụta ya. Nọdụ ala họpụtasịa ndị dị mma tinye ha nʼime nkata, ma tufuo ndị na-adịghị mma.
49Otu a ka ọ ga-adị nʼọgwụgwụ oge. Ndị mmụọ ozi ga-abịa kewapụ ndị ọjọọ site nʼetiti ndị ezi omume,