11E tinyere isi ya nʼefere bunye nwaagbọghọ ahụ. Ọ naara ya bulaara nne ya.
12Ndị na-eso ụzọ ya bịara buru ozu ya gaa lie. Ha gara kọọrọ Jisọs ihe mere.
13Mgbe Jisọs nụrụ akụkọ a, ọ banyere nʼụgbọ mmiri gaa nʼọzara, ebe ọ ga-anọdụrụ onwe ya. Ma mgbe igwe mmadụ nụrụ ya, ha si obodo dị iche iche sooro ya nʼukwu ala.
14Mgbe o sitere nʼụgbọ mmiri ahụ rịdata, ọ hụrụ oke igwe mmadụ. O nwere ọmịiko nʼebe ha nọ, gwọọ ndị ọrịa nʼetiti ha.
15Nʼoge anyasị ụbọchị ahụ, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya sị ya, “Chi na-achọ iji. Ebe a abụkwaghị ebe ndị mmadụ bi. O nweghị nri a ga-azụta nʼọzara a. Zilaga igwe mmadụ ndị a ka ha gaa nʼime obodo zụọra onwe ha nri.”