17Ha zara ya sị, “Ọ bụ naanị ogbe achịcha ise na azụ abụọ ka anyị nwere.”
18Ọ sịrị ha, “Wetaranụ m ha nʼebe a.”
19Ọ gwara igwe mmadụ ahụ ka ha nọdụ ala nʼahịhịa. O weere ogbe achịcha ise na azụ abụọ ahụ welie anya ya elu nye Chineke ekele. Ọ nyawara achịcha ahụ, nye ha ndị na-eso ụzọ ya, ndị na-eso ụzọ ya nyere ha igwe mmadụ ahụ.
20Onye ọbụla riri rijuo afọ. Emesịa, ndị na-eso ụzọ Jisọs tụtụkọtara iberibe achịcha dara nʼala tụtụjuo ha nkata iri na abụọ.
21Ma ndị riri nri ahụ dị puku ụmụ nwoke ise, nʼagụnyeghị ụmụ nwanyị, na ụmụntakịrị.