1Mgbe ahụ, ụfọdụ ndị Farisii na ndị ozizi iwu si Jerusalem bịakwute Jisọs jụrụ ya ajụjụ sị,
2“Gịnị mere ndị na-eso ụzọ gị adịghị erube isi nʼomenaala ndị okenye? Ha anaghị akwọ aka ha tupu ha erie nri.”
3Ọ zara ha sị, “Gịnị mere unu ji na-ada iwu Chineke nʼihi omenaala unu?
4Nʼihi na Chineke sịrị, ‘Sọpụrụ nne gị na nna gị,’ na, ‘onye ọbụla kwujọrọ nna maọbụ nne ya ka e gbuo ya.’
5Ma unu na-asị, ọ bụrụ na onye ọbụla ga-asị nna maọbụ nne ya, ihe ọbụla bụ nke ị gara erite nʼaka m bụ ‘onyinye dịrị Chineke.’