Matiu 15

Ọ tụrụ mmadụ niile nʼanya mgbe ha hụrụ ndị ogbi ka ha bidoro ikwu okwu. Mgbe ha hụkwara na a gwọrọ ndị aka ha, na ndị ụkwụ ha nwụrụ anwụ, o jukwara ha anya ịhụ na ndị ngwụrọ gara ije, na ndị ìsì hụkwara ụzọ. Ha toro Chineke nke Izrel.

Matthew 15:31 (UKJV) Insomuch that the multitude wondered, when they saw the dumb to speak, the physically disabled to be whole, the lame to walk, and the blind to see: and they glorified the God of Israel.

29Jisọs hapụrụ ebe ahụ lọghachi nʼakụkụ osimiri Galili. Ọ rịgooro nʼelu ugwu nọdụ ala.

30Igwe mmadụ dị ukwuu bịakwutere ya. Ha duteere ya ndị ngwụrọ, na ndị ìsì, na ndị aka ha na ndị ụkwụ ha kpọnwụrụ akpọnwụ, na ndị ogbi, na ọtụtụ ndị ọzọ. Ha tọgbọrọ ha nʼụkwụ ya, ọ gwọkwara ha niile.

31Ọ tụrụ mmadụ niile nʼanya mgbe ha hụrụ ndị ogbi ka ha bidoro ikwu okwu. Mgbe ha hụkwara na a gwọrọ ndị aka ha, na ndị ụkwụ ha nwụrụ anwụ, o jukwara ha anya ịhụ na ndị ngwụrọ gara ije, na ndị ìsì hụkwara ụzọ. Ha toro Chineke nke Izrel.

32Jisọs kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya sị ha, “Ana m emere igwe mmadụ ndị a obi ebere, nʼihi na mụ na ha anọọla ụbọchị atọ nʼebe a, ma ha eribeghị nri ọbụla. Agaghị m ezilaga ha na-erighị nri, nʼihi na ha nwere ike ịda nʼụzọ.”

33Ndị na-eso ụzọ ya sịrị, “Ebee ka anyị ga-enweta nri ga-ezuru igwe mmadụ ndị a nʼọzara a?”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.