32Jisọs kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya sị ha, “Ana m emere igwe mmadụ ndị a obi ebere, nʼihi na mụ na ha anọọla ụbọchị atọ nʼebe a, ma ha eribeghị nri ọbụla. Agaghị m ezilaga ha na-erighị nri, nʼihi na ha nwere ike ịda nʼụzọ.”
33Ndị na-eso ụzọ ya sịrị, “Ebee ka anyị ga-enweta nri ga-ezuru igwe mmadụ ndị a nʼọzara a?”
34Jisọs jụrụ ha sị, “Ogbe achịcha ole ka unu nwere?” Ha sịrị ya, “Ogbe achịcha asaa na azụ ole na ole.”
35Ọ gwara igwe mmadụ ahụ ka ha nọdụ ala.
36O weere ogbe achịcha asaa na azụ ole na ole ahụ kelee Chineke ekele. Ọ nyawasịrị ha, nye ndị na-eso ụzọ ya. Ndị na-eso ụzọ ya nyekwara igwe mmadụ ahụ.