9Ma mgbe ha si nʼelu ugwu ahụ na-arịdata, Jisọs nyere ha iwu, sị, “Unu agwala onye ọbụla ihe unu hụrụ tutu ruo mgbe Nwa nke Mmadụ ga-esi nʼọnwụ bilie.”
10Ndị na-eso ụzọ ya jụrụ ya sị, “Gịnị mere ndị ozizi iwu ji na-ekwu na Ịlaịja aghaghị ibu ụzọ bịa?”
11Ọ zara sị, “Ọ bụ ezie, Ịlaịja na-abịa, ọ ga-emekwa ka ihe niile dị ka ọ dị na mbụ.
12Ma Ịlaịja abịalarị, ma ndị mmadụ amataghị ya. Kama ndị mmadụ emeela ya ihe ọjọọ dị iche iche. Otu a kwa ka mụ onwe m bụ Nwa nke Mmadụ ga-esi ahụ ahụhụ site nʼaka ha.”
13Mgbe ahụ ndị na-eso ụzọ ya ghọtara na ọ bụ Jọn omee baptizim ka ọ na-ekwu banyere ya.