21Mgbe ahụ Pita bịakwutere ya jụọ ya ajụjụ sị, “Onyenwe anyị, ọ bụ ugboro ole ka m ga-agbaghara nwanne m nke mehiere megide m? Ọ bụ ugboro asaa?”
22Jisọs zara sị ya, “Ọ bụghị ugboro asaa. Kama ị ga-agbaghara ya ruo iri ugboro asaa ụzọ asaa.
23“A ga-eji alaeze eluigwe tụnyere eze ahụ kpebiri ka ya na ndị ọrụ ya gụzie ego ya ha ji.
24Mgbe ha malitere na-apịazi, a kpọtaara eze ahụ otu onye nke ji ya ụgwọ ruru puku talenti iri.
25Nwoke ahụ enweghị ihe ọ ga-eji kwụọ ụgwọ o ji. Nna ya ukwu nyere iwu ka e refuo ya na nwunye ya na ụmụ ya, na ihe niile o nwere, ka akwụghachi ụgwọ o ji.