26“Ma ohu ahụ dara nʼala, gbukwaa ikpere ya nʼala, rịọ ya arịrịọ sị, ‘Onyenwe m, biko, nwee ntachiobi nʼebe m nọ. Aga m akwụghachikwa gị ụgwọ niile m ji gị.’
27Nna ukwu onye ọrụ ahụ nwere ọmịiko nʼebe ọ nọ, meere ya ebere. Ọ sịrị ya akwụghachila ụgwọ o ji ọzọ.
28“Ma mgbe ohu ahụ sitere nʼebe ahụ pụọ, ọ hụrụ otu ohu ibe ya ji ya ụgwọ otu narị denarị. O jidere ya nʼaka ike, machie ya aka nʼakpịrị, sị ya, ‘Kwụghachi m ụgwọ i ji m ugbu a.’
29“Ya mere, ohu ibe ya ahụ dara nʼala nʼihu ya rịọọ ya ka o nye ya nwantịntị oge. Ọ rịọkwara ya sị, ‘Enyi m, biko nwee ntachiobi, aga m akwụghachi gị ụgwọ m ji gị.’
30“Ma o kwenyeghị, kama ọ gara tụba ya nʼụlọ mkpọrọ, ebe ọ ga-anọ ruo mgbe ọ kwụsịrị ụgwọ niile o ji ya.