Matiu 19

Ọ zara ha sị ha, “Ọ bụ nʼihi na unu bụ ndị mkpọchi obi, ya mere Mosis jiri hapụ unu ka unu gbaa nwunye unu alụkwaghị m; ma ọ dịghị otu a site na mbụ.

Matthew 19:8 (UKJV) He says unto them, Moses because of the hardness of your hearts suffered you to put away your wives: but from the beginning it was not so.

6Ya mere, ha abụkwaghị mmadụ abụọ ọzọ, kama otu anụ ahụ. Ya mere, ihe Chineke jikọtara, ka mmadụ ọbụla atọsala ya.”

7Ha jụrụ ya sị, “Gịnị mekwaranụ Mosis ji nye iwu si na nwoke ọbụla nwere ohere ide akwụkwọ alụkwaghị m nye nwunye ya?”

8Ọ zara ha sị ha, “Ọ bụ nʼihi na unu bụ ndị mkpọchi obi, ya mere Mosis jiri hapụ unu ka unu gbaa nwunye unu alụkwaghị m; ma ọ dịghị otu a site na mbụ.

9Ma ana m asị unu, onye ọbụla ga-ahapụ nwunye ya lụrụ onye ọzọ, ma ọ bụghị nʼihi na o jidere nwunye ya na mmehie ịkwa iko, onye ahụ emeela mmehie ịkwa iko ma ọ lụọ nwanyị ọzọ.”

10Ndị na-eso ụzọ ya sịrị ya, “Ọ bụrụ na o si otu a dịrị, ọ ka mma na mmadụ alụghị nwunye ma ọlị.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.