21Ya mere, o biliri, kpọọrọ nwantakịrị ahụ na nne ya, laghachi nʼala Izrel.
22Mgbe ọ nụrụ na eze ọhụrụ gbanwere Herọd na Judịa bụ nwa ya a na-akpọ Akelus, egwu tụrụ Josef ịlaghachi ebe ahụ. Ma nʼihi na adọwo ya aka na ntị na nrọ, ọ wezugara onwe ya gaa nʼakụkụ Galili.
23Ọ gara biri nʼobodo a na-akpọ Nazaret. E sitekwara otu a mezuo okwu ọnụ ndị amụma sị na, “A ga-akpọ ya onye Nazaret.”