Matiu 2

Ha zara ya sị, “Na Betlehem nke Judịa. Nʼihi na otu a ka onye amụma ahụ dere nʼakwụkwọ sị,

Matthew 2:5 (UKJV) And they said unto him, In Bethlehem of Judaea: for thus it is written by the prophet,

3Mgbe eze Herọd nụrụ nke a, obi lọrọ ya mmiri nke ukwuu, ya na ndị niile bi na Jerusalem.

4Mgbe ọ kpọkọtara ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu niile, ọ jụrụ ha, olee ebe e kwuru na a ga-amụ Kraịst ahụ.

5Ha zara ya sị, “Na Betlehem nke Judịa. Nʼihi na otu a ka onye amụma ahụ dere nʼakwụkwọ sị,

6“ ‘Ma gị onwe gị, Betlehem, dị nʼala Juda, ị dịghị nta karịchasịa nʼetiti ndị ọchịchị Juda, nʼihi na ọ bụ site na gị ka onye ọchịchị ga-esi pụta, onye ga-achị ndị nke m Izrel.’”

7Mgbe ahụ Herọd kpọrọ ndị amamihe ahụ na nzuzo jụpụta ha banyere oge kpakpando ahụ ji pụta ìhè.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.