Matiu 2

O zipụrụ ha ije Betlehem sị ha, “Gaanụ lee anya nke ọma chọpụta ebe nwantakịrị ahụ nọ. Mgbe unu chọtara ya, bịanụ mee ka m mara, ka m gaakwa kpọọ isiala nye ya.”

Matthew 2:8 (UKJV) And he sent them to Bethlehem, and said, Go and search diligently for the young child; and when all of you have found him, bring me word again, that I may come and worship him also.

6“ ‘Ma gị onwe gị, Betlehem, dị nʼala Juda, ị dịghị nta karịchasịa nʼetiti ndị ọchịchị Juda, nʼihi na ọ bụ site na gị ka onye ọchịchị ga-esi pụta, onye ga-achị ndị nke m Izrel.’”

7Mgbe ahụ Herọd kpọrọ ndị amamihe ahụ na nzuzo jụpụta ha banyere oge kpakpando ahụ ji pụta ìhè.

8O zipụrụ ha ije Betlehem sị ha, “Gaanụ lee anya nke ọma chọpụta ebe nwantakịrị ahụ nọ. Mgbe unu chọtara ya, bịanụ mee ka m mara, ka m gaakwa kpọọ isiala nye ya.”

9Mgbe ha nụrụ okwu eze, ha pụrụ gawa, ma kpakpando ahụ ha hụrụ nʼọwụwa anyanwụ pụtakwara ọzọ, na-aga nʼihu ha ruo mgbe ọ bịara guzo nʼelu ebe nwantakịrị ahụ nọ.

10Ha ṅụrịrị ọṅụ nke ukwuu mgbe ha hụrụ kpakpando ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.