1“Ihe ọzọ a ga-eji tụnyere alaeze eluigwe bụ nwoke nwere ala ubi, onye pụrụ nʼisi ụtụtụ ịkpọta ndị ọrụ ga-arụ ọrụ nʼubi vaịnị ya.
2Ya na ndị ọrụ ahụ kwekọtara na ọ ga-akwụ ha otu denarị, nʼihi ọrụ ụbọchị ahụ. Emesịa o zigara ha nʼubi vaịnị ya.
3“Mgbe ọ pụrụ nʼihe dị ka elekere itoolu nke ụtụtụ, o sitere nʼebe a na-akpọta ndị ọrụ na-agafe hụ ndị ọzọ ka ha guzoro nʼọma ahịa na-enweghị ọrụ ha na-arụ.