10Ma mgbe ndị a kpọrọ ọrụ nʼisi ụtụtụ bịara ịnara ego ha, ha lere anya na a ga-akwụ ha karịa. Ma a kwụkwara ha niile otu denarị.
11Mgbe ha naara ego ahụ, ha tamuru ntamu megide nna nwe ụlọ,
12na-asị, ‘Ndị a bịara nʼikpeazụ rụrụ ọrụ naanị otu awa, ma i meela ka anyị na ha hara. Anyị bụ ndị buru ihe mgbu nke ọrụ ma okpomọkụ nke anwụ niile chara nʼụbọchị taa.’
13“Ma ọ zara otu nʼime ha sị, ‘Enyi m, emeghị m gị ihe ọjọọ ọbụla. Ọ bụ na mụ na gị ekwughị na m ga-akwụ gị otu denarị nʼụbọchị?
14Nara nke ruru gị laa. A chọrọ m ịkwụ ndị a bịara nʼikpeazụ ụgwọ dị ka m si kwụọ gị.