Matiu 20

“Ya mere, onye ikpeazụ ga-abụ onye bu ụzọ, ma onye bu ụzọ ga-abụkwa onye ikpeazụ.”

Matthew 20:16 (UKJV) So the last shall be first, and the first last: for many be called, but few chosen.

14Nara nke ruru gị laa. A chọrọ m ịkwụ ndị a bịara nʼikpeazụ ụgwọ dị ka m si kwụọ gị.

15Ọ bụ na m enweghị ike iji ihe m nwere mee otu ọ masịrị m? Ọ bụ anya ukwu ka ị na-enwe nʼihi afọ ofufu m?’

16“Ya mere, onye ikpeazụ ga-abụ onye bu ụzọ, ma onye bu ụzọ ga-abụkwa onye ikpeazụ.”

17Mgbe Jisọs na-aga Jerusalem, ọ kpọpụrụ mmadụ iri na abụọ ahụ na-eso ụzọ ya nʼakụkụ sị ha,

18“Lee, anyị na-aga Jerusalem ebe a ga-arara Nwa nke Mmadụ nyefee nʼaka ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu. Ha ga-ama ya ikpe ọnwụ,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.