3“Mgbe ọ pụrụ nʼihe dị ka elekere itoolu nke ụtụtụ, o sitere nʼebe a na-akpọta ndị ọrụ na-agafe hụ ndị ọzọ ka ha guzoro nʼọma ahịa na-enweghị ọrụ ha na-arụ.
4Ọ sịrị ha, ‘Unu onwe unu gaakwanụ rụọ ọrụ nʼubi vaịnị m, ihe ọbụla ziri ezi ka m ga-akwụ unu.’
5Ya mere ha gara. “Ọ pụkwara nʼelekere iri na abụọ na elekere atọ nke ehihie, ma meekwa otu ihe ahụ.
6Mgbe o ruru elekere ise nke anyasị, ọ pụrụ hụ ndị ọzọ ka ha guzoro. Ọ jụrụ ha ajụjụ sị, ‘Gịnị mere unu ji guzoro nʼebe a taa niile na-arụghị ọrụ?’
7“Ha zara sị ya, ‘Nʼihi na ọ dịghị onye kpọrọ anyị ọrụ.’ “Ọ gwara ha sị, ‘Unu onwe unu gaakwanụ rụọ ọrụ nʼubi vaịnị m. Aga m akwụkwa unu ihe dị mma.’